03/03/2026
Isiokwu: Omenaala (Ibi Ugwu)
NKOWA IHE BU IBI UGWU
Ibi ugwu bụ umendu gbasara nkwa na ofufe. Ọ bụ ụzọ ofufe nke ndi otu Christ mgbe ahụ Chukwu nwere ọgbụgba ndụ ya na nna anyi Abraham, ruo taa ndi Igbo na-ebi nwa ha ugwu. O nwere mgbe ana-ebe nwoke na nwanyị ugwu ma a choputara na ibi nwanyị ugwu na-ebute ọnwụ ha mgbe a na-amụ nwa. Nke a mere o ji dị mkpa ka a kwụsị ibi nwanyi ugwu.
N’ala Igbo, ọ bụrụ na amụọ nwa nwoke, mkpụrụ ụbọchị asatọ a muru nwa (8 days) a ga-ebe ya ugwu. O bu onye odoro anya nke ukwu na-ebe ugwu. O bu n’oge ututu ma ọ bụ n’oge mgbede ka a na-ebe nwa ugwu nke a bu ka ọbara ghara ịgba nwata ahụ nke ukwu.
Onye ọka mmụta (specialist) n’ebi ugwu na ani n’oba ma ọ bụ n'akụkụ azụ ụlọ ebe juru oyi. Ana-eji owu (thread), rezo, na owu (cotton wool) ebe a na-ebe ugwu na-adị ezigbo ọcha maka ụmụ ọrịa ịbanye onye ahụ nke nwata jiri buru nwoke ma mee ka o nwee ọrụ.
Ọ na-ama mma nke ukwu onye e bere ugwu ma bee ya nke ọma.
IHE MERE EJI EBE UGWU
* Iji chọọ onye ahụ mma.
* Iji mezuo agbam ndụ dị n’etiti Chukwu na nna anyi Abraham.
* Iji kenye nwata ahụ oke n’etiti ụmụnna ya.
* Ibi ugwu na-eme ka amụ nwoke di iche na nke anụmanụ .