
20/04/2024
ABU { POETRY } - CHINEDU E. OFOMATA
NWA MMEHIE
Lee onwe gị anya
Ahụ gị niile unyi unyi
Udele ka gị mma
Isi gị ka nke nkapi
I mejuola, tetọọ ma pitọo
Ọ dọrọla
Ịhụ gị bụ ọnwụ ọnwụ
Azụ gị bụ njọ njọ
Akụkụ gị, ilu ilu
Okpuru gị apịtị apịtị
Ije gị bụ nlaghachi azụ gị
Ime Obi gị bụ urukpu urukpu
Echiche gị juputara n'ọchịchịị
Nwa mmehie
Tụgharịa ma lezie anya
Chọba Chukwu kere gị
Ma gbakwuru ya
Gwa onwe gị eziokwu
Ka ụwa kuru gị
Ma nye gị ọnọdụ kwesịrị gị.