
06/08/2025
*IKWO AYI ETEHU OO*
Mmemme NNEFIỌHA bụ mmemme eji abanye afọ ọhụrụ nke ndị Ikwo. Ọ bụ mmemme eji ekele Chineke maka ndụ na akụ. Ọ bụ oge nkea ka ndị Ikwo na aro amara na Ngozi na aka okike kere uwa na ndị Ichie.
Ememe n'egosi na NNEFIỌHA adila nso gụnyere: Orie echa, Eke ọzụrụ ọla, Nchọnu ọjị-nji, Nkwọ ọkpụ íshí ugvu, dịrị gawazie.
Na oge NNEFIỌHA, ndị Ikwo nile na ezukota na ama Noyo (Ili Noyo) ikele ya maka nchekwa na ime ka ihe akọrọ n'ubi dị mma. Oge ahụ bukwa oge anyị na egosi njirimara anyị.
N'aha mu na ezinụlọ m, ana m ekpe na: Afọ ọhụrụ a ga-adiri anyị mma____Iseee. Afọ ọhụrụ a ga ewetara anyị Udo ____Iseee. Afọ ọhụrụ a ga ewetara anyị ịhụnanya, na aha Chukwu Okike, Iseeeeee 🙏🙏
Ọ ga adiri Nwoke mma, dịrị Nwanyị mma 🙏🙏🙏
_____✍🏽
Amagu Erimogwudu son