25/05/2026
Ihea abụghị meat market , Gịnị ka ọ bụkwanụ?
Nke a bụ obi mmadụ nyere n'onyinye (donor human heart). Ana-edebe ya ka ọ dịrị ndụ n'èzí ahụ̀ ahụ site n'iji igwe na-eme ka obi na-akụ kpum kpum, dịka nke ana akpọ Organ Care System (OCS) ma ọ bụ igwe ọzọ yiri ya a na-akpọ "Heart in a box device nke pụtara obi n'ime igbe".
Ngwa chere ka m tapia ihe na eme na foto a.
• Obi ahụ: Nke ahụ bụ ezigbo obi mmadụ sitere n'aka onye nyere onyinye, anyị nwere ike ikpọ onye ahụ heart donor, Ị nwere ike ịmata ya site n'ụcha ya, akwara ya, na ọdịdị ya — ọ bụghị nke arụrụ arụ, ilee ya ọfuma ịga ahụ na ihea abụghị ọkpa Nsukka nke oji abụ ọkpa Enugu k**a ihea bụ ezigbote obi mmadu•
Gịnị banyere Igwe ahụ?:
Paịpụ ndị ahụ doro anya, pọmpụ, na ihe eji ejikọ ha niile bụ akụkụ nke igwe na-eme ka ọbara na-ekpo ọkụ, nke nwere ikuku oxygen na-aga n'ime obi, na-eme ka ọ nọgide na-akụ kpum kpum n'èzí ahụ.
Ihe kpatara ya: Ụzọ ochie e si ebufe akụkụ ahụ bụ iji iceblock(mmírí kpụkọtara ọnụ) n'ime igbe oyi, nke na-enye ndị dọkịta na-awa ahụ naanị ihe dị ka awa 4-6 tupu obi amalite imebi. Igwe dị ka nke a nwere ike idobe obi ka ọ dị mma ruo ogologo oge — mgbe ụfọdụ ruo awa 12 ma ọ budi karia— ma na-enye ndị dọkịta ohere ịlele etu o si arụ ọrụ tupu etinyezie ya n'ahụ onye ọzọ.
Ngwa ka anyị tiwazie aki oyibo nsugbe na ihe na eme na foto a:
1. Obi ahụ nọ n'elu ihe nkwụnye ojii, e jikọtakwara ya na paịpụ ndị na-abanye n'ime nnukwu akwara — aorta, pulmonary artery, wdg.
2. Ntọala ọcha ahụ nwere aka bụ ụdị nke igwe TransMedics OCS Heart system, nke ụlọ ọgwụ na ahụ maka obi n'ụwa niile na-ejikari.
Teknụzụ a agbanweela ihe gbasara otú obi mmadụ si akụ n'anọghi n'ime ahụ mmadụ ma na-eme ka akụkụ ahụ nwee ike ịdị ndụ ịga ebe dị anya ma na-enye ndị dọkịta na-awa ahụ ohere itenyere Onye ọzọ obi ndị na-agaghị adị ndụ ma e jiri iceblock (mkpụrụ mmiri)chekwaa ha.
Ọ dị egwu ịhụ, mana obi ahụ na-akụ n'ezie n'elu igwe ahụ — naanị na ọ nweghị ahụ ọ dị na ya.