Father Chidozie

Father Chidozie Catholic Priest

15/05/2026
28/04/2026
27/04/2026

Bịa mụta ka e si agụ Igbo. Ị ga-amụtakwa ọbụladị otu ihe n’asụsụ ọzọ n’ebe a. Ihe anyị kpọrọ ya bụ: Ihe Ọgụgụ.

Anyị ga na-agụ otu ihe ọgụgụ a gụrụ n’aja Misa ebe a, bido taa. Anyị ga-ajụkwanụ ajụjụ maka ihe mmụta anyị mụtara na ya.

Ka ọ masị gị isonye. Chukwu gọzie gị.

27/04/2026

Jiri nke a wee chịgharịa uche

23/04/2026

N’afọ 2007, ndị ụlọ ụ́kà Anthony nke Padua, dị na Nkpọr Anambra State, rịọrọ m ka m bia kweere ha ukwe ka ha na-eme Valentine maka ndị ntorobia ha. M wee dee ukwe a i ji kọwara ha na Ịfụnanya bụ ime uche Osebrụwa.

Nwa a mụrụ oge ahụ di afọ iri na itoolu ugbu a (19 years). Chai! Ndị agbụrụ m akalichakwaala 😁 .

Mana emechaa, n’afọ 2021, m were ukwe a dozigharia ya, tie ya n’ụlọ egwu ka egwu ndi Alụmdinanwunye. Aha ya na Youtube bụ “Ịfụnanya”.

Ị hụla na o teelarịị udo, oganihu, na ịfụnanya ụmụnne ji amasi m.

22/02/2026

Nnọọ n'ụka nke mbụ na lentị. Nọrọ n'ekpere mgbe nịile ka Ị wee nwee ike imeri ekewnsu na ọnwụnwa ya nịile. Ka Chineke ji ike nịile nyere anyị aka ịgbanahụ ọnwụnwa nịile nke ekwensu, n'aha Nna, na Nwa na Mmụọ nsọ. Amen 🙏

21/02/2026

Echi bụ ụbọchị ụka. Gbaa mbọ gaa ụka, gee ntị n'okwuchukwu ma tinyekwa ya n'ọrụ. Ka chi fonu!

21/02/2026

Dịka anyị na-aga njem n'oge a pụrụ iche na ndụ anyị dịka ndị otu Kristi, gbaa mbọ hụ na Ị sonyere nke ọma.

Ka Chineke ji ike nịile nyere anyị aka ịnọgidesi ike n'okwukwe anyị site n'ekpere nakwa ebumọnụ, n'aha Nna, na Nwa na Mmụọ Nsọ. 🙏🙏

18/02/2026

N’uche gị, kedu ihe a ga-eme ka ndị ntorobia (youth) nwebe anụmọkụ n'obi n'ebe efemchukwu dị karia ka ha si enwe ugbu a?

Address

Onitsha Archdiocese
Onitsha
00234

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when Father Chidozie posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Share