Nasụigbo Television.

  • Home
  • Nasụigbo Television.

Nasụigbo Television. All our contents are original (from our desk) Jiri asụsụ Igbo mebe ọnụ.
(2)

07/12/2024
10/10/2024

celebrate people when they are still alive

30/08/2024

Ọ bụrụ na ALEX OTTI pụrụ imezi ala ABA ma nye ndị bi n'ime ya olileanya, NAIJIRIA pụrụ ịdị mma ọzọ ma anyị nweta ezigbo onye ndu. ỤMỤ ABA, Kedụ ka obi dị unu??

Gịnị kam ga-eme?Ejim okwukwe (Faith) banye ụlọ oriri na nkwari, jiri okwukwe nwee olileanya anya na tupuu mụ erichaa ma ...
28/08/2024

Gịnị kam ga-eme?
Ejim okwukwe (Faith) banye ụlọ oriri na nkwari, jiri okwukwe nwee olileanya anya na tupuu mụ erichaa ma kwarichaa aga enweriri otu onye ga a bịa kwụọrọm ụgwọ ihe m riri.
Kemgbe otu awa (hour) kam tachara pizza, shawarma, nkwobi na Moet.. Ndị a enyela m BILL,. Lekwa ka nwoke nwe ebea si nọdụ n'azụ elem kam wepụta ego.
Purse (akpa) mụ a dị ebea gba ọtọ ma gbara ọnụ.
Gịnị kam ga-eme ugbua?

Ọ bụ mụ mebe ka onye ogbii?
Onye ma ihem ga eme gwa m.

Ihe mere Chineke jiri gbagoo eluigweỤMỤ NWAANYỊ NA NSOGBUỊma ihe mere Chineke jiri were ọsọ hapụ ụwa gbagoo eluigwe?Mgbe...
27/08/2024

Ihe mere Chineke jiri gbagoo eluigwe
ỤMỤ NWAANYỊ NA NSOGBU

Ịma ihe mere Chineke jiri were ọsọ hapụ ụwa gbagoo eluigwe?

Mgbe gboo, Chukwu na ndị mmadụ bi n'elu ụwa.. Ọ bụrụ na ị choba ihe gị achọba, ịgakwuru Chukwu ozugbo, ọ gwa gị ebe ya bụ ihe dị ma ọ bụ onye ji ya.
Dịka ụbọchị na-aga, ụmụ nwaanyị anaghị ekwezi Chukwu zuo ike. Nke tọgbọ ATANJELE ya n'elu akwa (bed) ọ gbapụ ọsọ ozugbo gaa ịjụ Chukwu onye zuuru ATANJELE ya... Onye dozie eriri ọgọdọ ya, o fepu ọsọ gaa ị jụ Chukwu onye zuuru eriri ọgọdọ ya.. Otu nwaanyị bidoro ighe *PLANTAIN * wee tagide ya n'ọkụ tupuu oghechaa. Ozugbo oghechara, *PLANTIAN *
epezie ya mpe n'anya, ọ gbapụ ọsọ ozugbo gaa jụọ Chukwu onye tara *plantain* ya. Iwe were Chukwu nke ukwuu, Chukwu wee sị ya 'nwaanyị, ojoko gị dị n'ime afọ gị.

Otu n'ime ụmụ nwaanyịa nọ ebea rọchiri #50 oretere n'ahịa n'isi ọgọdọ ya, gbapụ ọsọ gaa ịjụ Chukwu onye zuuru ego o ji bata ahịa, - - -''Heeeei, ụmụaka a ezugbuo m, Chukwu, onye zuuru #50 mụ retara ụnyaahụ? Iwe were Chukwu, ọ sị ya, '' Nwanyị, gịnị ka ikechiri n'isi ọgọdọ gị"?,

Nwaanyị a nọ ebea, SORRY! nke nwaanyị etie sị , '' Ewoo, ọ kwa eziokwu oooo''
Otua ka Chukwu si jiri iwe gbagoo eluigwe.

AṄỤRỊ IZU ỤKA ỌHỤRỤ DỊRỊ ANYỊ NIILE.
Ka izu ụka a maara anyị mma

Share, like, comment and follow Nasụigbo Television.

PHYNO Egosigo na ọ bụ ọkacha ibe. Atọrọ m ntị n'ala wee gee *egwu ire ọsọọsọ* RAP ọhụrụ nke Maazi Phyno gụrụ, dịka mụ ge...
25/08/2024

PHYNO Egosigo na ọ bụ ọkacha ibe.

Atọrọ m ntị n'ala wee gee *egwu ire ọsọọsọ* RAP ọhụrụ nke Maazi Phyno gụrụ, dịka mụ gechara egwu a, ekwere mụ n'isi ma kweta na PHYNO edenyego aha ya n'ime akwụkwọ nchekwa akụkọ *History book* nke ụmụ Igbo.

N'ime egwu ọhụrụ a, Phyno Fineoooo ji wanyọ jiri ire ọsọọsọ nke akọnuche jupụtara n'ime ya wee kpọọ aha ọtụtụ ụmụ Igbo ndị ndụ ha kwesịrị nghomi na ọtụtụ ndị rụrụ ọrụ ọma n'ala Igbo.

Otú ihe tọrọ m ụtọ bụ na enweghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị PHYNO kpọrọ aha ya nke gosiri na ndị ọchịchị anyị enye-beghi anyị ihe anyị tụrụ anya.

N'aha nile Phyno kpọrọ, aha ndịa bụ ya kacha kpọfeem ma masị mu👇👇👇👇👇👇

**Theresa Ọnụora
** Dora Akunyili
**Pericoma
**Osadebe
**N***a Raw nwanne
**Dr Sir Warrior
**Mike Orihedimma
**Pet Edochie
**Arthur Eze
**? N'ime aha ndị ọzọ fọdụrụ, kedụ onye ị chere ekwesiri iji mezuo aha iri mbụ ndia (THE FIRST TEN NAMES TO CONSIDER AS THE MOST MERITED)

Share, like, comment and follow Television. Nasụigbo .

Ihe Chukwu amaghị anya ya bụ ihe na-eme n'obodo anyị bụ Naijiria!Chukwu amaghị anya ya!Ee, buru oche ozi ọma gị laaram a...
24/08/2024

Ihe Chukwu amaghị anya ya bụ ihe na-eme n'obodo anyị bụ Naijiria!

Chukwu amaghị anya ya!
Ee, buru oche ozi ọma gị laaram azụ n'ihi Chukwu amaghị anya ọnwụ ike na ọnwụ mgbawa obi nilea na-eme n'obodo anyị.
Akụkọ ọnwụ mberede okporo ụzọ abụrụgo ihe eji agụ egwu aja taata n'obodo anyị ebe ọbara ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọ, okenye na nwata na-efe n'okporo ụzọ anyị kwa ụbọchị.
Chukwu amaghị anya ya!
Ee, ọ bụrụ na Chukwu ma anya ya, ihe ọ pụtara bụ na Chukwu kpachara anya kee Naijiria ma jiri mkpọrọmasị na ọnwụ ike wee na edu anyị ụlọ ebe ọ na-elekọta obodo ndị ọzọ anya karịchaa ala bekee n'ihi ọrara ahụ ịnụ ụdị akụkọ anya mmiri a n'obodo onye ọcha.

Chukwu amaghị anya ya!
Nchekwa ndụ na nchekwa okporo ụzọ dị ndị ọchịchị na ndị na-agba ya n'aka. Ọ bụrụ na ha emeghị ihe ekwesiri ime, oge ọbụla ịbara ụgbọala ịga achịrị ume n'aka n'ihi Odoro gị anya na ọ bụ ndagwurugwu onyinyo ọnwụ ka ị banyere n'ime ya.
Chukwu amaghị anya ya
Nanị oge ndị ọchịchị anyị ga a haziri anyị okporo ụzọ nkeọma!
*
Nanị oge ụgbọala si n'aka nri abịa ga akwụsị ịgba n'ọgba (lane) nke edosara ndị si aka ekpe!
*
Nani oge okporo ụzọ ọbụla ga-enwe ntụziaka (Road signs) ka ya bụ okporo ụzọ dị na ka ekwesiri isi wee kwụọ ụgbọala na ya!
*
Nanị oge ọkwụọ ụgbọala ọbụla ga-aga ụlọ mmụta ka esi akwọ ụgbọala na ka esi edobe iwu okporo ụzọ tupuu enye ya akwụkwọ ikike eji akwụọ ụgbọala
*
Nanị oge ụgbọala ọbụla ga etozu oké ịgba n'ụzọ tupuu eburu ya banye okporo ụzọ(Road worthiness)
*
Nanị oge ụgbọala gwomgworo, ụgbọala bu mmanụ ọkụ na ọtụtụ mgba ọkụ (tankers) , dangote, containers ga-akwụsị ime obere ụgbọala tinye isi ha etinye nke ha, Keke tinye isi ha etinye nke ha, Okada tinye isi ha etinye nke
*
Nke kacha mkpa!
Nanị oge gọọmenti Naijiria ga amata na NDỤ DI OKÉ ỌNỤ, NDỤ ABỤGHỊ IHE MMADỤ GA AGABA AHỊA, ỌRỤ PỤỌ TỤFUO YA dịka esi atụfu ya ụbọchị niile n'obodo anyị, GEE NTỊ
Naanị oge ihe ndia m dere ebea ga a bịa na mmezu,. OGE A KA IGA EKWETA NA CHINEKE AMAGHỊ ANYA ỌNWỤ MBEREDE OKPORO ỤZỌ ANA ANWỤ TAATA NA NAỊJIRIA, N'ihi ọbụrụ na ihe ndia were ọnọdụ, ỌNWỤ MBEREDE OKPORO ỤZỌ GA AKWỤSỊ.. Ọ ga a bụzi ihe aga na-anụ na ntụị ntụị (once in a while)

Odogwo a nọ ebea bụ onye nkụzi bọọlụ (coach) HEARTLAND FOOTBALL CLUB OWERRI.
Ọ nwụrụ unyahu bụ Friday n'ihe mberede okporo ụzọ dịka ha na-aga ịgba bọọlụ n'ala Abakirliki.
Ka mkpụrụ obi ya zuru ike na ndokwa
Iseeeeeeeeeeeeeeee
Share, comment, like.

24/08/2024

Onye ọcha na-asụ Igbo

Chineke wepụrụ anyị AZỤỌ UDE TEE YA OTU IZU ỤKA ATỌGBỌ YA CHỌBA ỌZỌ 😀Kedụ ihe mere gị ijiri tọgbọ ude ị zụrụ chọba ọzọ?1...
12/08/2024

Chineke wepụrụ anyị AZỤỌ UDE TEE YA OTU IZU ỤKA ATỌGBỌ YA CHỌBA ỌZỌ 😀

Kedụ ihe mere gị ijiri tọgbọ ude ị zụrụ chọba ọzọ?

1. Ọ na-agba gị nje ihu (pimple)
2. Ọ na agbaji gị oji
3. Ọ na acha gị ọcha
4. Ọ na-ese gị eserese n'ihu (map)
5. Ọ na-eme gị ihu Fanta ọkpa coke

01/08/2024

Tụgharịa okwu a n'asụsụ IGBO
*The home boys are leading the cross-country show in our secondary school *

31/07/2024

If Mike Ejeagha dies today, he will die as a fulfilled and happy man.
Keep doing GOOD and keep imparting people.

Laa n'udo Maazi Ifeanyi UbahEbubeChukwu Ụzọ n'ala IgboAka hibere Capital oilD**e nyeere ọtụtụ mmadụ akaỌgaranya jere mba...
28/07/2024

Laa n'udo Maazi Ifeanyi Ubah
EbubeChukwu Ụzọ n'ala Igbo
Aka hibere Capital oil
D**e nyeere ọtụtụ mmadụ aka
Ọgaranya jere mba laba anụ eju ya akpa

Ihe ọ sọrọ gị mee n'ụwa, aga enweriri ndị ga-ekwutọ gị
Ma otu ihe doro ewu na ọkụkọ anya bụ na CHIEF IFEANYI UBAH bụ nnukwu ngọzi nye ala Igbo.

Laa n'udo nnukwu mmadụ
Jee ije gị nke ọma Ochie D**e
Ka mkpụrụ obi gị zuru ike na ndokwa
Iseeeeeeeeeeeeeeee

Address


Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when Nasụigbo Television. posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Contact The Business

Send a message to Nasụigbo Television.:

Shortcuts

  • Address
  • Alerts
  • Contact The Business
  • Claim ownership or report listing
  • Want your business to be the top-listed Media Company?

Share