IGBO DỊ̀ GBOO

IGBO DỊ̀ GBOO IGBO DỊ̀ GBOO ebe ngosipụta na nkwalite:
🔻Asụsụ
🔻Edemede
🔻Ekike
🔻Omenala Igbo
dgz

Ichie Akụdo✍🏾

16/01/2025

Ọ masịrị gị na Ị bụ onye Igbo? 🤔

09/11/2024

Explain this Igbo Proverb

09/11/2024

What's the meaning of your Igbo name? 🤔💕

Celebrating my 10th year on Facebook. Thank you for your continuing support. I could never have made it without you. 🙏🤗🎉
29/08/2024

Celebrating my 10th year on Facebook. Thank you for your continuing support. I could never have made it without you. 🙏🤗🎉

19/07/2024

Gịnị bụ mpụtara aha gị na bekee? 🤔
Gịnị ka aha gị pụtara na Oyibo? 😊

23/06/2024

Kọwaa mpụtara ịlụ a
"Anya álọ̀rọ̀ d**e n'ọgbọ ọgụ, bụ nkiri ka-ana ekiri ya"

Kedụ ịlụ ọzọ yiri ịlụ a?

Ọ na-abụ oke mmụọ pụta ọgbọ, obere mmụọ agbalaga Ma chi onye adịghị n'izu, ihe anaghị eme onyeMa ọnwụ egbughị ji ejiri c...
01/05/2024

Ọ na-abụ oke mmụọ pụta ọgbọ, obere mmụọ agbalaga

Ma chi onye adịghị n'izu, ihe anaghị eme onye

Ma ọnwụ egbughị ji ejiri chụọ aja, ọ ga-epuriri ome

Nnukwu igwe

Igbo sịrị na anya hụrụ okenye ahụla ndị mmụọ

Ka emume ncheta ụbọchị ọmụmụ gị wetara gị ọṅụ, akụ, ihuike, ihu ọma, isiọma, dgz...

Ugọgbọrọ miara gị oooo
Akunauba gaa n'ihu n'igbara gị odibo
Ndụ ndụ, Nká nká

Ụwa makwara gị mma ooo ✌🏾

Aṅurị ncheta ụbọchị ọmụmụ gị Prince Chukwukelue Obi ( Ígwé Chinedugo )

Isé
Isé
Isé

© Michael Chukwugekwu Obiesie






Gọọrọnụ ya ọfọ ndụ 🙏🏾

EKPERE ỤTỤTỤIkpe mara eziokwu aka azụ dị ya!Éze okike kéré Mmadụ!Oseburuwa oké mmụọ! Anyị pụtara ụra tata, makana ọ bụ o...
19/04/2024

EKPERE ỤTỤTỤ

Ikpe mara eziokwu aka azụ dị ya!

Éze okike kéré Mmadụ!
Oseburuwa oké mmụọ!
Anyị pụtara ụra tata, makana ọ bụ onye ịyere ndụ na-adị
Anyanwu awaálá
Bịa taa ọjị makana onye hapụ ihe oji achọ mma, mma ya alụọ
Ọkụkọ ghara kwọm ojiri gịnị zụo ụmụ ya?
Ọ na-abụ mbe gaba ọ kpụrụ okpokoro ya

Ahia anọ igbo na-ázú bịanụ taa ọjị
Egu na-amụ nri Nna m ochie bịa taa ọjị

Asị m na ọ ga-adịrị anyị na mma n'Eke
Isee!
Anyanwu ga-awaala anyị n'Orie
Isee!
Afọ ga-na afọtara anyị ihe ọma ooo
Isee!
Mmiri ozuzo zooro anyị na Ǹkwọ ooo
Isee!
N'ihu n'ihu ka anyị ga-na aga makana ọsọ Mgbada bụ n'ihu

Ikpe nkwụmọtọ kam riọrọ taa makana anya mmụọwụ adịghịzị n'ebe akpọpụrụ ya.
Okenye anaghị anọ n'ụlọ ewu amụọ n'ogbịlị
Okwu Igbo!
Mmadụ anaghị ekechaa kporo
Mmadụ anaghịkwanu aga chị ya n'ihu
Eziokwu na ntị bụ nwanne

Ka ikpe nkwụmọtọ waara anyị ka ọnwa!
Isee!

Awele kam gọrọ taa bụ Ǹkwọ
Ọfọ!
Ọ bụ ire ọma ka ejula ji-aga n'ógwú
Makana nwa nza ná-ágbá egwu n'ama nwere ihe na-akụrụ ya egwu n'ọhịa

Ọ ga-abara anyị!


Isee!
Isee!!
Isee!!!

Ozi eziri awụrụ ọkụ erugo eluigwe nti

ỤTỤTỤ ỌMA NỤ

Ịgba Mmụọ bụ Óménàlà IgboKedụ aha obodo gị na-akpọ Mmanwu a?
11/04/2024

Ịgba Mmụọ bụ Óménàlà Igbo

Kedụ aha obodo gị na-akpọ Mmanwu a?

Check out IGBO DI GBOO’s video.

Igbo karịrị ihe eji márá ya!I were isi ọma ibụ́ Onye Igbo.Igbo kwezuonu!        Michael Chukwugekwu Obiesie GBOO DỊ̀ IGB...
08/04/2024

Igbo karịrị ihe eji márá ya!

I were isi ọma ibụ́ Onye Igbo.

Igbo kwezuonu!






Michael Chukwugekwu Obiesie
GBOO DỊ̀ IGBO

Check out IGBO DI GBOO’s video.

07/04/2024
Ee, Ọ na-abụ di ochi yụọ ahụ yụọ nsị, nke dị ijiji mma ọ ghọrọ.Agha ákàrà aka anaghị eri ngwọlọ.Tata bụ́ ahịa Ǹkwọ abalị...
07/04/2024

Ee, Ọ na-abụ di ochi yụọ ahụ yụọ nsị, nke dị ijiji mma ọ ghọrọ.

Agha ákàrà aka anaghị eri ngwọlọ.

Tata bụ́ ahịa Ǹkwọ abalị nke asaa n'ọnwa anọ nke afọ puku abụọ na iri abụo na anọ (7/4/2024) ka ákàrà/ e nyibere ngosiputa ekike na emume Óménàlà Igbo na Aki-dayosisi nke Ọnịcha, dika ndi ntorobịa siri nyibe ya.
Ya mere sonyere m na ngosiputa omenala Igbo.

Igbo kwuru si "Onye kpọ́ ọbá ya mkpọkọrọ, agbataobi enwere ya kpo ahịhịa"

Ụtụtụ ọma nụ Ìgbo wara ka anyanwụ

© Michael Chukwugekwu Obiesie



25/02/2024

Kedụ ka eke si-anya anwụ n'ogbe gị? 🤷🏾‍♂️

Tụgharịa ₦1,500,000 n'asụsụ Igbo 🤔

Address

Ogidi

Telephone

+2348123904294

Website

Alerts

Be the first to know and let us send you an email when IGBO DỊ̀ GBOO posts news and promotions. Your email address will not be used for any other purpose, and you can unsubscribe at any time.

Contact The Business

Send a message to IGBO DỊ̀ GBOO:

Share