16/08/2025
Ncheta Mejọ Christopher Ifeakandụ Ọkigbo
N’ụbọchị taa n’afọ 1932 ka a mụrụ Christopher Ọkigbo. Ọ bụ onye Ojoto nke dị n'Anambra Steeti. Chris kwuru hoo haa na ọ lọọrọ nne ya ochie ụwa. Ọ gara akwụkwọ na Gọọmentị Kọlegi Ụmụahịa, mechazịa gaa mahadum dị n'Ibadan.
N'ebe a ka ọ gbanwere ịgụ maka ịbụ dọkịta, gụwa "Classics." Oge ọ pụtara mahadum n'afọ 1956, ọ rụrụ ọrụ n'ọtụtụ ụlọọrụ tutu o nweta ọrụ n'ọbaakwụkwọ nke mahadum Nsụka. Ọ bụ ebe a, ka ọ malitere gosiwe na akwụkwọ ọ gụrụ abụghị n'efu, mgbe ọ dewere abụ, maka n'ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ, agwọ.
Ka agha Biafra malitere n'afọ 1966, Chris gbara ụkwụ n'ala Igbo ozigbo, ma banye amị Biafra, maka ọ ma nke ọma na onye ụjọ anaghị azọtanwu ihe ọ bụla. Agha a liri isi ya mgbe ndị soja Naịjirịa batara Nsụka. Ọzọkwa ụfọdụ akwụkwọ ya ebipụtabeghị gbara ọkụ mgbe agha rutere Enugwu.
N'agbanyeghị ọdachi a, ọ bụghị akwụkwọ dum o dere, ọ na-ebipụteghị gbara ọkụ. O nwere ndị pụtara ihe mgbe agha biri, nwekwa ndị nwa ya nwaanyị bụ Ọbịageli ji.
Ka mkpụrụ obi ya na-ezu ike n'udo.
Amen 🙏🏾