21/03/2025
Ụmụaka Nwekwara olu nke ha(Children Also Have a Voice)
Nneka bụ nwanyị nwere mkpebi siri ike. Ọ dịla afọ ise ka ọ lụọ di, mana otu ihe na-emekarị n'ụlọ ya: a naghị ege ụmụaka ntị.
Nke a mere ka nwa ya nwoke, Ebuka, bụrụ nwa na-adịghị ekwu okwu n’ihu ndị mmadụ. Ọ na-enwe ọtụtụ ihe n’obi, mana mgbe ọ bụla o kwuo ihe, nne ya na nna ya na-asị, "Umuaka adịghị ekwu okwu n'ihu ndị okenye!"
Otu abalị, mgbe Nneka na-elele Facebook, o chọtara otu edemede gbasara ọrụ nne na nna n’ịkwado ụmụaka n’ịmụ asụsụ Igbo. O gụọchara ya, ọ kwụsịrị, chere echiche.
"Ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ka Ebuka ghara ikwu okwu, kedu ka ọ ga-esi mụta asụsụ Igbo? Kedụ ka ọ ga-esi bụrụ nwa nwere obi ike n'ọdịnihu?"
N’echi ya, Nneka malitere ịjụ Ebuka ajụjụ. Ọ nyeere ya ohere ikwu okwu. O bidoro na-agwa ya akụkọ Igbo, na-agwa ya ka o kwughachi ya. Mgbe o si n'ụlọ akwụkwọ lọta, o gwakwara ya, “Gịnị ka ị mụtara taa?” Ma tinye ntị na ya.
Oge na-aga, Ebuka malitere nwee obi ike. Ọ nweghịzi ụjọ ikwu okwu. O bidoro na-agwa nne ya akụkọ nke ya. Nneka ghọtara na ụmụaka nwelụkwara okwu, ma ọ bụrụ na a na-ege ha ntị.
Ugbu a, Nneka na-eji YouTube na Facebook kesaa akụkọ Igbo, ka ndị nne na nna mụọ otú e si akwado ụmụaka n’ịmụ asụsụ Igbo.
Ọtụtụ nne na nna bidoro ijikọta ya, na-asị, "Nneka, i meela! Anyị amatabeghị na ife dị mkpa otú a!"
Kee ntị Ọ bụrụ na ị bụ onye nne ma ọ bụ onye nna, jisie ike! N'Ege ntị na ụmụaka gị. Ha nwere okwu, ha kwesịrị ka a nụ ọlụ ha!