
29/07/2025
Ncheta Chukwuma Nzeọgwụ na Ụmụnakwe Agụiyi-Irọnsị
N'ụbọchị taa ka soja ụmụ Igbo abụọ a, zara oku ọnwụ. Nzeọgwụ nwụrụ na agha Biafra n'afọ 1967, ebe Agụiyi-Irọnsị nwụrụ n'afọ 1966, n'aka ndị soja Naịjirịa. Nzeọgwụ bụ onye Anịọma dị na Delta Steeti. Ọ banyere armị n'afọ 1957, ebe o ruru ọkwa majọ.
Mgbe agha Biafra malitere, Nzeọgwụ nke ruola ọkwa "Lt. Colonel" na armị ndị Biafra zutere ọnwụ ya na Nsụka. Ka agha biri, onyeisi ala bụ Gowon nyere iwu ka e lie ozu ya na "Military Cemetery" nke dị na Kaduna, ma kwanyere ya ugwu ruru ya.
A mụkwara Johnson Ụmụnakwe Agụiyi-Ironsi n'ụbọchị nke atọ, n'ọnwa March n'afọ 1924. Ọ bụ onye Ibeku dị n'Ụmụahịa, Abịa Steeti. Ọ banyere armị n'afọ 1942, ebe o ruru ọkwa Majọ-Generalụ. E mere ya onyeisi ala Naịjirịa na Janụarị n'afọ 1966 ka Nzeọgwụ na ndị soja ụfọdụ wetara ọchịchị ndị nkịtị na njedebe.
A kpara ya nkata ọnwụ na Ibadan nke ọ dabara n'ime ya. E gburu ya na Fajuyi na Ibadan. Agụiyi-Ironsi Ironsi gbara afọ iri anọ na abụọ oge ọ nwụrụ. Ka mkpụrụ obi ụmụ Igbo abụọ ndị a na-ezu ike n'udo.
Amen 🙏🏾